3Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
4Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.
5Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala, na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala. Mgbidi ya ka ọ na-eme ka ọ daruo ala.
6Ọ na-enyefe obodo ahụ nʼaka ndị a na-emegbu emegbu, na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.
7Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu, gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.