Aịzaya 29

Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ, ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ.

Isaiah 29:18 (UKJV) And in that day shall the deaf hear the words of the book, and the eyes of the blind shall see out of obscurity, and out of darkness.

16Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala, ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite. Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị, “Ị kpụghị m”? Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite, “Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?

17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe, ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?

18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ, ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ.

19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.

20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.