14Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya, amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi, nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.”
15Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha, ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha, “Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”
16Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala, ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite. Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị, “Ị kpụghị m”? Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite, “Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?
17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe, ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?
18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ, ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ.