12Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.”
13Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.
14Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya, amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi, nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.”
15Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha, ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha, “Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”
16Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala, ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite. Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị, “Ị kpụghị m”? Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite, “Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?