21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.
22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.
23Mgbe ha hụrụ ụmụ ha, bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb, ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.
24Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta, ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”