Aịzaya 29

Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu, aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.

Isaiah 29:3 (UKJV) And I will camp against you round about, and will lay siege against you with a mount, and I will raise forts against you.

1Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel, gị obodo ebe Devid bi. Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme.

2Ma aga m akpagbu Ariel, ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa, ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.

3Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu, aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.

4Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala, okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta. Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala, ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.

5Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ, igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu. Mgbe ahụ, na mberede,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.