3Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu, aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.
4Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala, okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta. Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala, ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.
5Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ, igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu. Mgbe ahụ, na mberede,
6mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijiji na oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha.
7Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha, bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha, ga-efu dịka nrọ, onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ.