15Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
16Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
17Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
18Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ,
19ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu,