11Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru, tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi. Yipụnụ uwe ọma unu, kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe.
12Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju, nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ.
13Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu. Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ, na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ agakwaghị adị.
14Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike, gbahapụkwa obodo ahụ ụzụ na-adị nʼime ya; ụlọ elu nche niile na ebe niile ewusiri ike ga-abụ ebe ga-atọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi, ha ga-aghọ ebe ịnyịnya ibu ọhịa ga na-enwe obi ụtọ, na ebe igwe anụ ụlọ ga na-akpa nri ha.
15Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa.