Aịzaya 33

Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.

Isaiah 33:4 (UKJV) And your spoil shall be gathered like the gathering of the caterpillar: as the running back and forth of locusts shall he run upon them.

2Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ, nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya. Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile, bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.

3Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị. Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga.

4Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.

5Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu. Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn.

6Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile, ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma; egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.