1Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi, onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka. Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu, onye na-enwebeghị ndị rafuru gị. Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe ka a ga-ebibi gị, mgbe ị kwụsịkwara nrafu ka a ga-arafu gị.
2Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ, nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya. Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile, bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.
3Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị. Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga.
4Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.
5Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu. Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn.