Aịzaya 36

Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”

Isaiah 36:20 (UKJV) Who are they among all the gods of these lands, that have delivered their land out of my hand, that the LORD should deliver Jerusalem out of my hand?

18“Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu mgbe ọ na-asị, ‘Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’ O nweela chi niile nke ndị mba ọzọ, nke napụtarala ala ha site nʼaka eze Asịrịa.

19Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m?

20Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”

21Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.”

22Mgbe Eliakịm nwa Hilkaya, onyeisi ọchịchị, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, ode akwụkwọ akụkọ eze laghachikwuuru Hezekaya, ha dọwara uwe ha mgbe ha na-aga igosi ya ịda mba nke obi ha. Ha gwakwara ya ihe niile onyeisi agha ndị Asịrịa kwuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.