16“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:
17ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị jupụtara nʼime ya.
18“Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu mgbe ọ na-asị, ‘Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’ O nweela chi niile nke ndị mba ọzọ, nke napụtarala ala ha site nʼaka eze Asịrịa.
19Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m?
20Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”