11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ nʼala ndị dị ndụ, m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ, maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.
12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ. Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa o bipụla ndụ site nkwe-akwa, ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.
13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ. Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile. Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.
14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa. Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ. Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe. Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”
15Ma gịnị ka m ga-ekwu? Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a. M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile nʼihi ihe mwute nke obi m.