17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m, ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a. Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m site nʼolulu nke ịla nʼiyi. I werela mmehie m niile wefee nʼazụ gị.
18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.
19Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto, dị ka m na-eme taa. Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
20Onyenwe anyị ga-azọpụta m, anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara nʼụbọchị niile nke ndụ anyị, nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
21Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”