Aịzaya 38

Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m, ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a. Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m site nʼolulu nke ịla nʼiyi. I werela mmehie m niile wefee nʼazụ gị.

Isaiah 38:17 (UKJV) Behold, for peace I had great bitterness: but you have in love to my soul delivered it from the pit of corruption: for you have cast all my sins behind your back.

15Ma gịnị ka m ga-ekwu? Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a. M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile nʼihi ihe mwute nke obi m.

16Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ. Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha. I nyeghachila m ahụ ike, mee ka m dị ndụ.

17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m, ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a. Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m site nʼolulu nke ịla nʼiyi. I werela mmehie m niile wefee nʼazụ gị.

18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.

19Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto, dị ka m na-eme taa. Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.