10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.
11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
12Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?
13Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị, maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe?
14Ọ bụ onye ka Onyenwe anyị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe, ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma? Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma, maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta?