15Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere; a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe; ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ.
16Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja. Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja.
17O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya; ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru, dịka ihe na-erughị ihe efu.
18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri?
19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.