17O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya; ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru, dịka ihe na-erughị ihe efu.
18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri?
19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.
20Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure. Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma, onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada.
21Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?