25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ.
26Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu.
27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”
28Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
29Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.