27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”
28Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
29Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.
30Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,
31ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.