16Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel.
17“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa, mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha. Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ.
18Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.
19Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu,
20ka ndị mmadụ hụ, matakwa, tuleekwa uche ma ghọta, na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a, na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya.