18Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.
19Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu,
20ka ndị mmadụ hụ, matakwa, tuleekwa uche ma ghọta, na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a, na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya.
21“Wepụtanụ mkpesa unu,” ka Onyenwe anyị sịrị, “Doo okwu unu nʼusoro,” ka Eze nke Jekọb na-asịkwa.
22“Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị, ihe gaje ime. Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara, ka anyị nwee ike tulee ha matakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha. Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa,