1“Lee ohu m, onye m na-agba ume, onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ. Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya. Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
2Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa, maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi.
3Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara azọpịa, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị. Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi.
4Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba, ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa. Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.”
5Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.