3Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara azọpịa, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị. Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi.
4Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba, ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa. Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.”
5Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.
6“Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m. Aga m echebe gị, gbaa gị ume, nʼihi na eweere m gị nye ndị m ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike. Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile.
7Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha.