4Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m, ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya, aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị. Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.
5Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị. Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị.
6Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha, ‘Hapụnụ ha ka ha laa, unu egbochikwala ha.’ Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi,
7onye ọbụla nke a na-akpọ aha m, onye m kere nʼihi otuto m, onye m kpụrụ, ma meekwa.”
8Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe.