Aịzaya 43

Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe.

Isaiah 43:8 (UKJV) Bring forth the blind people that have eyes, and the deaf that have ears.

6Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha, ‘Hapụnụ ha ka ha laa, unu egbochikwala ha.’ Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi,

7onye ọbụla nke a na-akpọ aha m, onye m kere nʼihi otuto m, onye m kpụrụ, ma meekwa.”

8Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe.

9Mba niile dị iche iche ezukọtala, mmadụ niile agbakọtakwala. Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme, onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga? Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi, ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.”

10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.