Aịzaya 44

Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya; tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala. Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile, unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị, nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb, na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.

Isaiah 44:23 (UKJV) Sing, O all of you heavens; for the LORD has done it: shout, all of you lower parts of the earth: break forth into singing, all of you mountains, O forest, and every tree therein: for the LORD has redeemed Jacob, and glorified himself in Israel.

21“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb, nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m. Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m; gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.

22Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii, hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ. Lọghachikwute m, nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.”

23Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya; tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala. Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile, unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị, nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb, na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.

24“Otu a, Onyenwe anyị na-ekwu, Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ: Mụ onwe bụ Onyenwe anyị, Onye kere ihe niile, onye gbatipụrụ eluigwe, onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m,

25onye na-emebi ihe ịrịbama niile nke ndị amụma ụgha na-emekwa ka ndị na-ajụta ase ghọọ ndị nzuzu, onye na-ekpu ihe ọmụmụ ndị maara ihe ihu nʼala tụgharịa ya, ha ghọọ ihe nzuzu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.