20Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya. Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị, “Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?”
21“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb, nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m. Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m; gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.
22Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii, hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ. Lọghachikwute m, nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.”
23Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya; tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala. Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile, unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị, nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb, na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.
24“Otu a, Onyenwe anyị na-ekwu, Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ: Mụ onwe bụ Onyenwe anyị, Onye kere ihe niile, onye gbatipụrụ eluigwe, onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m,