9Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga, nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa. Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.
10Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite, ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu. Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide. Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’
11Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe, e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke ahụ ga-abịa mee nzube m. Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo; ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.
12Geenụ m ntị, unu ndị isi ike, unu ndị nọpụrụ ezi omume m nʼebe dị anya.
13Ana m eweta ezi omume nso, ọ dịghị nʼebe dị anya, nzọpụta m agaghị anọkwa ọdụ. Aga m enye Zayọn nzọpụta, nyekwa Izrel ịma mma m.