Aịzaya 46

Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha, buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ. Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa. Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza, ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.

Isaiah 46:7 (UKJV) They bear him upon the shoulder, they carry him, and set him in his place, and he stands; from his place shall he not remove: yea, one shall cry unto him, yet can he not answer, nor save him out of his trouble.

5“Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha? Onye ka unu ga-eji tụnyere m?

6Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya, na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ, were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi, emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.

7Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha, buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ. Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa. Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza, ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.

8“Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya, ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.

9Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga, nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa. Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.