Aịzaya 47

Were nkume igwe nri gwee ọka, wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị. Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị, mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche.

Isaiah 47:2 (UKJV) Take the millstones, and grind meal: uncover your locks, make bare the leg, uncover the thigh, pass over the rivers.

1“Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu, gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn, nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze, gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn. Agaghị akpọkwa gị onye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke.

2Were nkume igwe nri gwee ọka, wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị. Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị, mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche.

3A ga-ekpughe ọtọ gị, tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere. Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ, agaghị m elekwa anya nʼazụ.”

4Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye nsọ Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.