2Were nkume igwe nri gwee ọka, wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị. Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị, mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche.
3A ga-ekpughe ọtọ gị, tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere. Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ, agaghị m elekwa anya nʼazụ.”
4Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye nsọ Izrel.
5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị, gị eze obodo nke ndị Kaldịa; Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị nwanyị nwe alaeze dị iche iche.
6Ewesoro m ndị m iwe, mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ. Eweere m ha tinye gị nʼaka, ma i gosighị ha obi ebere. Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha ka ị bokwasịrị ibu arọ.