1“Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb, unu ndị a na-akpọ nʼaha Izrel, ndị si nʼagbụrụ Juda pụta. Unu ndị na-eji aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi, ndị na-akpọku aha Chineke nke Izrel, ma ọ bụghị nʼeziokwu maọbụ nʼezi omume.
2Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ, ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel. Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
3Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Mgbe m kwupụrụ ya, emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.