Aịzaya 48

Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Mgbe m kwupụrụ ya, emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.

Isaiah 48:3 (UKJV) I have declared the former things from the beginning; and they went forth out of my mouth, and I showed them; I did them suddenly, and they came to pass.

1“Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb, unu ndị a na-akpọ nʼaha Izrel, ndị si nʼagbụrụ Juda pụta. Unu ndị na-eji aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi, ndị na-akpọku aha Chineke nke Izrel, ma ọ bụghị nʼeziokwu maọbụ nʼezi omume.

2Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ, ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel. Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

3Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Mgbe m kwupụrụ ya, emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.

4Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike, matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji. Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz.

5Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga ihe m gaje ime, ka unu ghara ị sị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.