Aịzaya 48

Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga ihe m gaje ime, ka unu ghara ị sị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’

Isaiah 48:5 (UKJV) I have even from the beginning declared it to you; before it came to pass I showed it you: lest you should say, Mine idol has done them, and my graven image, and my molten image, has commanded them.

3Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Mgbe m kwupụrụ ya, emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.

4Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike, matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji. Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz.

5Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga ihe m gaje ime, ka unu ghara ị sị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’

6Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu, ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu. “Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ nke m na-agwabeghị unu na mbụ.

7Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie. Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ, ya mere, unu agaghị asị, ‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.