Aịzaya 48

Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ, ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel. Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Isaiah 48:2 (UKJV) For they call themselves of the holy city, and stay themselves upon the God of Israel; The LORD of hosts is his name.

1“Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb, unu ndị a na-akpọ nʼaha Izrel, ndị si nʼagbụrụ Juda pụta. Unu ndị na-eji aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi, ndị na-akpọku aha Chineke nke Izrel, ma ọ bụghị nʼeziokwu maọbụ nʼezi omume.

2Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ, ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel. Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

3Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Mgbe m kwupụrụ ya, emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.

4Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike, matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji. Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.