9na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile.
10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri.
11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie.
12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.”
13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha.