10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri.
11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie.
12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.”
13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha.
14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.”