11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie.
12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.”
13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha.
14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.”
15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.