Aịzaya 49

Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.”

Isaiah 49:4 (UKJV) Then I said, I have laboured in vain, I have spent my strength for nothing, and in vain: yet surely my judgment is with the LORD, and my work with my God.

2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya.

3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel. Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma na ike m.”

4Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.”

5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị, Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi; ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya, nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị, Chineke m aghọkwaarala m ike m.

6Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.