Aịzaya 49

Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ, e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha, “Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe. Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi, Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.”

Isaiah 49:7 (UKJV) Thus says the LORD, the Redeemer of Israel, and his Holy One, to him whom man despises, to him whom the nation detests, to a servant of rulers, Kings shall see and arise, princes also shall worship, because of the LORD that is faithful, and the Holy One of Israel, and he shall choose you.

5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị, Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi; ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya, nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị, Chineke m aghọkwaarala m ike m.

6Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”

7Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ, e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha, “Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe. Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi, Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.”

8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: “Nʼoge amara m, aga m aza unu, nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka. Aga m echebe unu, mee ka unu bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ, iweghachite ala ahụ na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu;

9na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.