1Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya, abụ banyere ubi vaịnị ya. Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala.
2O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya, werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya. O wuru ụlọ nche nʼetiti ya, sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya. Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi. Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị.
3“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
4Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?