2O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya, werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya. O wuru ụlọ nche nʼetiti ya, sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya. Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi. Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị.
3“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
4Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?
5Ugbu a, lee, ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a. Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya, hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri. Aga m etida mgbidi ya hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.
6Agaghị m akwachakwa ya ọzọ. Agakwaghị m egwuru ya ala, aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya. Aga m enyekwa igwe ojii iwu ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.”