Aịzaya 50

Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.

Isaiah 50:6 (UKJV) I gave my back to the smiters, and my cheeks to them that plucked off the hair: I hid not my face from shame and spitting.

4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.

5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ.

6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.

7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m.

8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.