Aịzaya 51

Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Isaiah 51:8 (UKJV) For the moth shall eat them up like a garment, and the worm shall eat them like wool: but my righteousness shall be for ever, and my salvation from generation to generation.

6Welienụ anya unu lee anya nʼelu, leekwanụ anya nʼụwa, nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ; ụwa ga-aka nka dịka akwa, ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji. Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.

7Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma, unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu. Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu, unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu.

8Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

9Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ?

10Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa? Mmiri ahụ dị omimi. Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya, ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.