3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.
4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.
5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.”
6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya. Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.
7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.