Aịzaya 56

Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.

Isaiah 56:10 (UKJV) His watchmen are blind: they are all ignorant, they are all dumb dogs, they cannot bark; sleeping, lying down, loving to slumber.

8Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”

9Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa. Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa.

10Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.

11Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke; ha adịghị enwe afọ ojuju. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta, ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha, onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya.

12Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya, ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị. Echi ga-adịkwa ka taa, ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.