Aịzaya 56

Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”

Isaiah 56:8 (UKJV) The Lord GOD, which gathers the outcasts of Israel says, Yet will I gather others to him, beside those that are gathered unto him.

6Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị ijere ya ozi, na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,

7ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m. Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere nʼebe ịchụ aja m. Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”

8Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”

9Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa. Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa.

10Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.