8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile, ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị. Ị gbakụtara m azụ, yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị, ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ, imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.
9Ị were mmanụ jekwuru Molek meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.
10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị, ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’ Ị chọtara ntute nye ndụ gị, ya mere, na ị daghị mba.
11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a? Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu? Ị naghị echetakwa m, ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị? Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile ka i ji hapụ ịtụ m egwu?
12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị, igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.